Stella Dimoko Korkus.com: IRI JI OHURU

Advertisement

Friday, July 20, 2018

IRI JI OHURU

Igbo kweenu.... Yaa!!!!
Igbo kwezuonu..... Iseee!!! 






Ndi be anyi mma mma nu. Nke onye chiri ya zere, egbe bere, ugo bere, nke si na ibe ya ama mbe, nku gbajie ya. 


Awuchi kwa m ozo taa ka anyi bu ndi igbo kpariata uka . Unu ma na ndi igbo bu ndi oru ugboala. Anyi na-akoputa otutu ihe dika ji, Osikapa, okwuru, ugh, dgz. N'ime ihe Nile a anyi na-akoputa, ji Bu nke ndi igbo ejighi egwu egwu. Mgbe gboo, a na-asi na onye nwere Nnukwu Oba ji bu ogaranya. Obodo o bula n'ala igbo na-eme mmemme iri ji ohuru. Ufodu na-akpo ya Afia Olu. 


N'ubochi mmemme Iri ji ohuru, nna nwe ulo ma obu diji na egwuputa ji ohuru(ufodu na azuta n'ahia), a na-azuta anu di iche iche dika :okuko, ewu, ehi na azu eji esi ji Awai. A na-esikwa ofe di iche dika onugbu, nsala na egwusi. A na-ahukwa ji ohuru na oku were ukpaka, ose na mmanu were rie ya.


 Mmemme Iri ji ohuru amaka n'ihi na o na-eme ka Obodo kpoo oku, otutu ndi mmadu na-esi Obodo di iche iche ha bi nata Obodo ha ka ha we sonye na mmemme a. A na ebidokari mmemme a site na onwa August rue na October. Kedu ka ndi Obodo gi so eri ji ohuru? I sonye nugo na mmemme a?, Kedu ife unu na akpo Iri ji ohuru na Obodo Gi?



This post is about NEW YAM FESTIVAL, and how it's being celebrated in igbo land. From next month, new yams will be harvested and it the festival will be celebrated all over igbo land before new yams will be sold in the markets. 

BV Amanda Favour.

40 comments:

  1. Obi dim uto na ihe idere ka mana ahubeghim ihe'm ga eji rie ji ohu ka odim uto.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Amy, suo ya asu ka o buru nri ji, iwelu ezigbote ofe nsala na obu onugbu wee rie ya, uto 😋😋

      Delete
    2. Chai akpiri egbugom eba o, nne biko kam biakwa. Ibu ezigbote nwa afo igbo

      Delete
    3. Amanda ezigbo nwa igbaliala, omenaala bu ndu!
      Mana munwa adighi acho i ri ji ohuru, m ga echetu obere oge.
      Imelaa nwanyi, jisike

      Delete
  2. Nice one Amanda. I thought new yam festival is being celebrated on September 16th.

    Igbo Kwenu!!!

    ReplyDelete
    Replies
    1. No Cynthia, it varies .
      Each town celebrate theirs when they deem fit,

      Delete
  3. Dalu Amanda nwayioma 😘😘😘😘
    New yam should come oh

    ReplyDelete
    Replies
    1. @Olori obu gi dere ihe a? @Princess Tever

      Delete
    2. Daalu so olori 😘😘😘

      Delete
    3. Tever what are you saying

      Delete
    4. @Olori I said are you the person that wrote this igbo?

      Delete
  4. Nne.... ndi ideato amakwanum otu ha ne me nke ha. Maka anagim a la ulo ime new yam festival

    ReplyDelete
    Replies
    1. Haha 😀😁, Odimma. Daalu lolo

      Delete
    2. Eyoooo! Ji nmeme na mama Oge iri ji ohuru. Ware nmanu ohuru igwe akwu na ugba, unu, asu na akidi gbakuta ha. Madu ereputa ahu.....

      Delete
  5. Ekenem unu oo...
    Amanda favour daalu sor.alikiom ji ofu ordis susor ka old ji ka nna liki.eerm nnabia let me go and look for whom to interprete

    ReplyDelete
  6. "and it will be celebrated " anon sic Biko na typographical error,don't come 😀😁

    Ndi be anyi Ngwanu putabanu,osetigo

    ReplyDelete
    Replies
    1. My dear na my matter she/he carry for head now ooo

      Imaghim ihem mere ya these days

      Delete
    2. Amanda, su pu ya,oso ndi, o Wendi. A na mu atu mpete ebe a,ya by ji ofu esiro ike ofuma otu mu choro. Na oge na eteghi aka, Erie mua maka na Ji na ugba by nmasim rinne. Igbo amaka. Ya ga ziere Stella nwanyi OMA na ndi Nile bu agbata obi anyi ebe a. Udo!!!!

      Delete
  7. Before I read what was below, I was wondering what the post was about. Cos the picture looked nothing like yam. Was thinking stick, sausage.... ddnt think of yam

    ReplyDelete
    Replies
    1. Lol @ sausage 😀😁. The yam is suffering from recession

      Delete
  8. Nwannem Nwanyi Amanda Favour, Chineke gozie gi. Anyi na eme emume iri ji n'onwa asato (August) . O na di kpoo kpoo. Oge ahu ruo, agam eme ka imara. @Princess Tever

    ReplyDelete
  9. Amaghi ka anyi si eri ji.mana ndi owere na eri ya ubochi “oru owerri” ... oru,oru-owerri

    ReplyDelete
    Replies
    1. O nne, oru owerri ka unu na akpo ya? A muta kwa m nkea taa. Daalu rinne

      Delete
  10. Amaghi ka anyi si eri ji.mana ndi owere na eri ya ubochi “oru owerri” ... oru,oru-owerri

    ReplyDelete
    Replies
    1. Chidindu, o GI by ifea? Kedu maka nwa GI nwoke? Ada owerri kedu?

      Delete
    2. Nwa Nwoke di nma Nke ukwu..ari Ada owerri nwu...e Toro m na owerri

      Delete
  11. OK, i can't wait for the festival to come biko, new yam 🍠 on my mind as the old yams almost impossible to buy because of the high price

    ReplyDelete
  12. we buy dead,scrap or faulty inverter battery call me.08117903918/0814139511320 July 2018 at 14:47

    Nwaayi oma ekele m gi

    ReplyDelete
  13. Amanda, su pu ya,oso ndi, o Wendi. A na mu atu mpete ebe a,ya by ji ofu esiro ike ofuma otu mu choro. Na oge na eteghi aka, Erie mua maka na Ji na ugba by nmasim rinne. Igbo amaka. Ya ga ziere Stella nwanyi OMA na ndi Nile bu agbata obi anyi ebe a. Udo!!!!

    ReplyDelete
  14. Nwaada Amanda dalu ooh.Odiro nfe ide ogologo edemede aah,Ekene kwa mu gi.
    Ya bu iri Iji bu esigbo Nmenme na ala Igbo.Mana obodo ebe mu si,anyi adiro eme ya ibu iri Ji maka na anyi enwero Igwe.Ekene diri chukwu na anyi enwego Igwe kita.Igwe Pharm Alex Onyido..i'm proud meehn!
    Nke afo ga di kpo kpo..Ya bu iri Ji nke afo ya bu nke mbu anyi ga awa kee mgbe Igwe ofuu baalu.Ofala anyi meechiri akwukwuo na afo gara aga.I'm really looking forward to this year's own..

    ReplyDelete
  15. one of the reasons i dont like the igbo culture, as them go church reach them still dey practice tradition. wats the meaning of new yam festival in this time and age? anyone wey reply me no get work. its my opinion

    ReplyDelete

Disclaimer: Comments And Opinions On Any Part Of This Website Are Opinions Of The Blog Commenters Or Anonymous Persons And They Do Not Represent The Opinion Of StellaDimokoKorkus.com

Pictures and culled stories posted on this site are given credit and if a story is yours but credited to the wrong source,Please contact Stelladimokokorkus.com and corrections will be made..

If you have a complaint or a story,Please Contact StellaDimokoKorkus.com Via

Sdimokokorkus@gmail.com
Mobile Phone +4915210724141