Igbo kweenu.... Yaa
Igbo kwezuonu.... Isee!!!!
Ndi be anyi ekele kwa m unu, nke onye chiri ya zero. O tego kwa aka anyi kparitara uka na asusu Anyi. Isiokwu anyi ji bia taa Bu maka OMU NKWU. E ji m na aka na nwa afo igbo obula ma Ihe bu OMU? O buru na imaghi, OMU Bu igu nkwu akebeghi aka, nya bu nke ka na -aputa aputa . Mgbe mbu, e chekwa m na obu so a na eme uka OMU ka o na aba uru, mana OMU nwere otutu ihe eji ya eme na-ala igbo.
1.E ji OMU aru ulo akanye.
2. E ji ya ekechi ogiri.
3. E ji ya egosi na ihe di egwu dikwa, dika n'ala a na-azo azo MA obu ebe a na-egbu osisi, ka ndi mmadu ghara ibia nso.
4.E ji OMU egosi ihe e doro nso.
5.A na amanye OMU na fine na ugboala Bu ozu mmadu .
6. A na-ege OMU n'ulo ahia onye nwuru anwu..
Nkea Bu ufodu ihe eji OMU eme nke mma, gwakwa anyi ndi nke I mara.
Daalu nu ummunne m, chetakwa nu ka Anyi na asu asusu anyi bu igbo na a kuzi kwara ya Umu anyi, ka asusu anyi na omenala anyi di mma ghara ifu.
Ka e mesia
Anamekele ndi igbo o
ReplyDeleteAnyi na-ekele kwa Gi nne
DeleteOgini Igbo kwenu ooo..
Deletebico aghotaram ihe omunkwu bu bico onwe onye ga kowara ya
DeleteNdi Igbo umu Nnem anam ekene ooooπππππππππ
ReplyDeleteDalu nooo
Anam abiaπΆπΆπΆπΆπΆπΆ kwa
Daalu nne, biko chighata azu osiso π
DeleteThe translation of this your comment eeπ€£π€£π€£π€£ππ igbo is a funny language @Stella Babe.dalu
DeleteAmawbia ugbo ogiriga
ntupo adighi na ihe ikpara. Kedu ka esi etinye ya na igwe computer?
ReplyDeleteNwanne m amaghi m, Biko onye ma ka esi etinye ntupo ma a na-ede asusu igbo bia gwa anyi
DeleteEnwe keyboard Γgbo. I ga eme ya download ma α»bu na ekwentα» gα» nwere ya. Lol kam chia α»chα». Amaghα» m ede Γgbo mΓ nΓ anam anwa. π
DeleteI tried reading in English and what Google gave me was the funniest and most disjointed sentences ever...
ReplyDeleteChike, come and bail us out
ππππ
DeleteEji omu egozi ala ana azoazo . Ejikwa ya egozi ebe udo adighi ma eme nsogbu di.
ReplyDeleteAmawbia ugbo ogiriga
Eji omu etiputa oke mmonwu(mmonwu shinne). Ejikwasi ya eli okenye ma agba mgba.Daalu kwanu.
DeleteNdeewo nu Ada Amawbia na Ada Aguiyi
DeleteNdi Igbo birikwenuoooo. eje omu edochi ala ana azo azo, ana amanye ya na ulo ndi mmadu ma ihe aru mee na obodo. Enwere mgbe nna tuwara nwa ya nwanyi ime na obodo anyi, ndi okenye gara tunye omu na ulo onye obula.
ReplyDeleteNdeewo nwanyi oma
DeleteChukwu gozie gi nke'oma. ndewoo umunne'm. Ka osepuru uwa gba'gu`ume. Obi di mu utoor na nkowa 'e kowa anyi.
ReplyDeleteChim o! I bu onye Igbo? Ewooo, Oko onu, amu atogbu o la m!
DeleteSo inube maka onye a`na kpo dike a`na gbari izu nke mbu? nwa chi na sulu uzo. Ichie TEEJAY SDK DIVA.
DeleteDaalu ichie TEE-JAY
DeleteBiko Teejay, anu be ho m o. I bu nwoke ka I bu Nwanyi? “Diva” bu Nwanyi. O buru na m nwere efe, akara m i nyere gi aka nwa obere na bekee. Ji sie ike nwa Nna. Igbo biri kwa o
Delete15:07 De`mee ooh! Chukwu gozie gi, chedokwa gi ni`ihi na nsogbu juru nu uwa.
Deleteanyα» maara na Canberra na asα»₯sα»₯ gα» na omenala gα» ga-efu ma hα»₯kwara gα» n'anya nke ukwuu otΓΊ α» si eme ka α»dα»bendα» gα» dα»rα» n'α»gbα» gα».
ReplyDeleteα» bα»₯rα»₯ na m nwere ike α»jα»₯, olee α»gwα»₯ ndα» m nwere ike iji α»zα», ike gwα»₯rα»₯ m α»ga α»₯lα» mposi .. nke a na-aga otu izu ugbu a
Mc pinky
Daalu mcpinky, mana aghotaghi m ihe idere
DeleteIgbo bu Igbo ekele m'unu.
ReplyDeleteNna idere ofuma
eji omu nkwu egechi ebe nwanyi di ya nwuru no
Eji ya egechi onu ite nkwu ocha.
Ndi n'eso oke nmonwu n'etinye ya n'onu ma ha buru ite ogwu.
Daalu Nwanne m nwanyi
DeleteWow Ralu M I'm impressed. Daalu nwanyioma
DeleteDalu kwa'nu umu igbo anyi!.Omu bakwara esigbo uru na ala Igbo..Mu bu ADA-IDE ji ya bu Omu mee decoration mbochi mgba nkwu!.Omere ya bu mgbako adi more traditional..
ReplyDeleteIgbo Amaka!..
Ada Ada daalu Nwanne m
DeleteOriaku Amanda Favour, Onyenweanyi gozie gi na iwelite mmΓΊΓ³ anyi elu na asΓΊsΓΊ anyi bΓΊ igbo. ObΓΊ ihe di mma maka na Γ»fΓ΄du na ime anyi echezosigo ka esi ede edemede igbo. Ejikwa Γ³mΓΊ eme echekwa ΓΊlo (fencing) na ime obodo. Udo diri unu✋✋✋
ReplyDeleteUdo diri kwa gi Nwanne m
DeleteAmaro kwa m ihe ozo eji ya bu ife eme apart from d listed. Lool!
ReplyDeleteEkene kwa mu unu o.
Sandy yo Onye Engligbo ππ...Igbo amaka, igbo di uto... umu Nnem ekene kwamunu .
DeleteStella nwanyioma, Udo diri gi ..
nwanyi oma πππ
Delete*apart from the listed* ππππ Jehova bu eze!
DeleteNo one to interpret? Teejay over to you.
ReplyDeleteumu Igbo ibem ekene oooo.
ReplyDeleteAmanda ya gaziere GI nke OMA.
1. ana ekechi ya na ite ogwu.
2. Eji ya afiochi onu manya ocha
3. Eji ya egosi ihe di nso.
4. eji ya eke otumokpo, nwanne iwotago ...hahahaha
Same girl
Amanda is talking about the uses of palm leaf.
if you know anyone say it and I will translate it in Igbo.
as for the uses Amanda listed, it has no English version. It has only native version so I will advice you find someone from your tribe that hears Igbo that will translate it to you in your language.
ogwu ka oha m na onu.
Aurora ino ebee?
Fan Emmanuel bia nga na ibu nwafo amusiri ike.
Bloglord, TGW and Adadioramma kedu ebe unu nno? biko puta nu na igwe. asi na anyuko mamiri onu ogba ufufu.
Mazi Chike o'tua ko di. Ezigbote nwafor ki`ibu. nara`m atoor. Igbo amaka jianyi ooh.
DeleteChike Chike!!!
DeleteEzigbote nwafo ka ibu
Ha! Chike nwa nna ibiakwa!! Odinke nma? π
DeleteTeeJay onye nke anyi ya gaziere GI nke OMA.
DeleteOriaku Amanda, ndi be anyi siri na gidigidi bu ugwu Eze maka na ofu osisi adighi eme ohia ya mere anyi jiri puta na Uju ikwado gi. Ejikwa m ohere a ayo ndi Igbo aputabeghi kwado edemede Igbo a ka ha puta gosi ihe eji maka ya si na Igbo Amaka.
Stella what is this. Your blog is for different tribes and a common language is better than this nonsense. Some people open every post you know. No translation nothing. Pls it's somehow.
ReplyDeleteLife is not that serious. Pls take it easy. Get an Igbo friend to interprete it for you.
DeleteOnye si ΓΆya!!!!!! Gbafuo nga ugbu a tupu mu eweta apianpia. Umuazi ugbu a na amaghΔ― nsΓΆ
DeleteOh so you are the fellow who went crying to Stella complaining about this post? Ibu ezigbote uchu.
DeleteTo think that I was been polite in today's IHN sef in replying. It's your own language that is nonsense you tribalistic animal!
When Stella writes in German I didn't see you writing to complain oh! But here you are foaming at the mouth nkita ara.
This blog is big enough so send yours to Stella and keep off this post!
@ anon 13.10... life is not that serious. Stella is only trying to promote our diverse cultures and heritage. She has put up a Yoruba piece in the past. I don't read Yoruba but I hear and I thought it was noble of the writer. The piece is only talking about the different uses of palm leaves.
DeleteSays it can be used to make houses/roofs.
Can be used to show that a terrible thing just happened.
Used to warn people off a land in dispute.
Mark a family that has committed a sacrilegious act.
Used to show that a VVIP/an revered elder just died.
And a host other stuff.
Please don't be offended by the post. We should embrace our diversity and help promote our various culture and heritage.
#lovewins #onelove #onepeople #oneblessednigeria.
Remain blessed.
Chill abi you think they want to share money and code it?
DeleteHahaha anon 16:10, you no go kee me oo.
DeleteLMAO I just had this translated to English and it's hilarious!
ReplyDeleteHehehe πππ
DeleteNdi beanyi ekene m nuooo
ReplyDeleteEkele kwa m gi Asa
DeleteOriaku Amanda biko ahotaghim No5.isi na aji omu eme "fine" obu asusu bekee ko Igbo?
ReplyDeleteNwanne m biko wepu "fine" ahu inugo, edeteghi m ihe m choro ide
DeleteOmu nkwu for aziza (broom).
ReplyDeleteOmu nkwu for ute (mat).
O bunu bekee ka Γ―na asu di ihe a?
DeleteUmu efulefu.
Engirigbo π
DeleteLmao @ efulefu. Abughim efulefu nwa Ada. A nam eye nwam ara Oge m dere ya, ya mere m jiri dee Engligbo osiso. Abukwam okacha mara n'asusu Igbo. E nwerem Igbo A1 na Waec. Biko laa Azu, tupu mu atupu gi n'ogbo.
DeleteDaalu.
Nwanyi oma ekwete'm na`ngi. e`bu nwa`afo Igbo ne eziokwu. Asusu gi dabara ofu ma.
DeleteNdi be anyi ekele kwa m unu, nke onye chiri ya zero. O tego kwa aka anyi kparitara uka na asusu Anyi. Isiokwu anyi ji bia taa Bu maka OMU NKWU. E ji m na aka na nwa afo igbo obula ma Ihe bu OMU? O buru na imaghi, OMU Bu igu nkwu akebeghi aka, nya bu nke ka na -aputa aputa . Mgbe mbu, e chekwa m na obu so a na eme uka OMU ka o na aba uru, mana OMU nwere otutu ihe eji ya eme na-ala igbo.
ReplyDeleteTRanslation...........
Thank you, I thank you, the one who lost it. He also sponsors our conversation with Anyi. Our theme is here today for your quote. Are you kidnapped with breast cancer? If you do not know, you can read the text, but it's still appealing. At first, I was reminded that this was a part of the conversation and that it was worth it, but it had a lot of things to do with it.
ππππ. google na-asi asi
Deleteππππππππ
Deleteπππππ, Odikwaegwu
DeleteUmu nnem ndewo o. Oga adiri anyi na nma. Asusu Igbo ga adi gaa n'iru. Eji omu nkwu agbichi ozu. Iji gosi na mmadu nwuru ebe ahu, iji maa atu ebe enwere ihe mberede okporo uzo.
ReplyDeleteYa gazie o. Oga adiri anyi na nma n'aha Jesus.... Amen
Ndeewo love
Deleteummunna, igba liala oh...π
ReplyDeleteππππ
DeleteAna eji omu achupu ndi mere aru n'ala Igbo.
ReplyDeleteAna ejikwa ya ekesi osisi nami-puta mkpuru dika osisi udara, ma-obu ube, maka ndi oshi/osi/ori.
Udo diri anyi nile.
udo diri Gi ezigbote ada
DeleteIgbo nmanma nuooo.....
ReplyDeleteRie nu....
nuo nu...
Udo diri unu oo...
OMG! The goggle translation is nothing but pure gibberish! ππππ
ReplyDeleteOnye igbo kedu kodi?
ReplyDeleteIbata goro godo nma.
Hehehe πππ
DeleteIgbo bu Igbo ekenekwam unu. Ndu Nwoke Ndu Nwanyi, Ndu mmiri Ndu azu. Anyi ga adi ka echi maka na echi adighi agwu agwu. Ndi dibia igbo jikwa omu nkwu were aju ogu na ofor.
ReplyDeleteNdeewo Nnukwu nwanyi
DeleteNdewoo Ada ndi Igbo ji eje Mba.
DeleteAbracadabra!
ReplyDeleteKedu ebe "Lady Bug" no biko bia nye anyi olu. Ndi Igbo maanu mmaooooo
ReplyDeleteAna-etiunye omu nkwu ebe enwere ihe mberede okporo uzo. Igbo bu Igbo birikwaoooo
ReplyDeleteIBO amaka,daalu oo
ReplyDeleteDalu nne oma mela nke ukwu
ReplyDeletemana ihe m na aju gi bu gini ka omu na egosiputa na ala igbo