If you cannot Understand or write Igbo,excuse those who can while you read..Inugo?
IGBO KWEENU.......Yaa!
IGBO KWEENU........ Yaa!!
IGBO KWEZUONU...... Isee !!!
Ndi be anyi mmammanu !, nke onye chiri ya zere , O kwanu nwanne unu nwanyi bu BV AMANDA FAVOUR na-ekele. otela aka anyi sudobere asusu IGBO anyi na bloogu a, ya mere m jiri si ka anyi suo ya ta.
O nwere ajuju nwanna anyi bu B.v Chike juru m otu ubochi ebea, o siri m gwa ya ije bu window n'asusu IGBO. O bu ajuju a butere isi okwu m choro ka anyi tulee Tata bu OKWU MBITE.
Asusu o bula na-ebite mkpuruokwu n'aka asusu ndi MBA ozo wee mezuo nke ha ma o bu mee mkpuruokwu Di n'asusu ha ka o bawanye uba.
Ndi bekee, French, Yoruba, Awusa bitechara mkpuruokwu di iche iche wee mee ka asusu ha towanye. Ndi IGBO bitekwara Ufodu mkpuruokwu site n'asusu di iche iche mana anyi na ewere okwu mbite ndia dika okwu IGBO.
Omumatu Ufodu okwu mbite ya na asusu esi bite ya ..
1. Windo...... Bekee
2. Osikapa.....Awusa
3 Tebulu.........Bekee
4. Boolu.........Bekee
5. Akamu....... Awusa
6. Ogbono........Yoruba
7. Akawo...........Yoruba
8. Bokwu............. French
Chike ihulanu na windo bu mkpuruokwu anyi bitere n'asusu bekee? O buru na o nwere okwu mbite IGBO I Mara biko Bia gwa anyi.
Umunne m ogwukwanu ka o ra m na-onu, ka o di oge ozo.
Daalu nu umunne m
BV Amanda favour
IGBO KWEENU........ Yaa!!
IGBO KWEZUONU...... Isee !!!
Ndi be anyi mmammanu !, nke onye chiri ya zere , O kwanu nwanne unu nwanyi bu BV AMANDA FAVOUR na-ekele. otela aka anyi sudobere asusu IGBO anyi na bloogu a, ya mere m jiri si ka anyi suo ya ta.
O nwere ajuju nwanna anyi bu B.v Chike juru m otu ubochi ebea, o siri m gwa ya ije bu window n'asusu IGBO. O bu ajuju a butere isi okwu m choro ka anyi tulee Tata bu OKWU MBITE.
Asusu o bula na-ebite mkpuruokwu n'aka asusu ndi MBA ozo wee mezuo nke ha ma o bu mee mkpuruokwu Di n'asusu ha ka o bawanye uba.
Ndi bekee, French, Yoruba, Awusa bitechara mkpuruokwu di iche iche wee mee ka asusu ha towanye. Ndi IGBO bitekwara Ufodu mkpuruokwu site n'asusu di iche iche mana anyi na ewere okwu mbite ndia dika okwu IGBO.
Omumatu Ufodu okwu mbite ya na asusu esi bite ya ..
1. Windo...... Bekee
2. Osikapa.....Awusa
3 Tebulu.........Bekee
4. Boolu.........Bekee
5. Akamu....... Awusa
6. Ogbono........Yoruba
7. Akawo...........Yoruba
8. Bokwu............. French
Chike ihulanu na windo bu mkpuruokwu anyi bitere n'asusu bekee? O buru na o nwere okwu mbite IGBO I Mara biko Bia gwa anyi.
Umunne m ogwukwanu ka o ra m na-onu, ka o di oge ozo.
Daalu nu umunne m
BV Amanda favour
Osikapa bu rice Okwaya?
I just feel like eating @OHA soup after reading this igbo language
ReplyDelete@Galore
Taaa. Gbafwo. Oha gini? Gosim onu ichorigi ri oha
DeleteAna m ezitere gi oge ora na ngwugwu akpu abuo....hehehe
DeleteEven with google chrome translation I still don't understand.
DeleteAnybody wen go curse me for igbo language. ..make GOD help me punish am this rainy afternoon MABASI
Delete@Galore
*ofe*
DeleteIs stella igbo
DeleteStella by nwafor wafi. Mana ona o na sukwa igbo oge ufodu.
DeleteE chekwa m na window bu mpio. ndi kam mara ngwanu oo
DeletePlease what is "bokwu" @ Amanda et al
DeleteInteresting.....ndi igbo ke ebe unu no?
ReplyDeleteAnyi nor nerbaa
DeleteNne anyi nokwa ebe a
DeleteDaalu onye oma
Anyi jure ejuo
DeleteNdi igbo jury eju baru abaru.
DeleteNice one Miss Ess
DeleteHahaahaha
Nne Biko nsigini?
ReplyDeleteIfe nlacha m!💋
DeleteNne kedu Ije?
Bia were nsusu Nwa oma m💋
Sugar aburo onye Igbo?
DeleteNgwanu ooooo, ndi yardi m
ReplyDeleteIgbo kwenu!!!
Yaa!!! Kikiki
Delete@pipi lee,Ama mm na aga m afu gi ebea...lol
DeleteKedu nke na eme?
Umu egwu ndi a i na-agu ubochi nile a gara aga na atogbum atogbu ooo...pipilistic pipee!!
Ima ife ana aru..#wink
@MARTINS ABOY
He he he he he he he, ogbo m!!!
DeleteNna daalu, m na agbaghara gi nke ukwuu. Na agbalisi ike na Chineke na agozi gi ugwo oru do ukwuu.
Eleghara m typos biko (Ignore typos pls)
Sandy Yo!!!!
Kedu nke na-eme?
Pipi nwa, kedu ka i mere
DeleteAna m ekele o !
Pipi Yo ezigbo neighbour m, onwero kwa nke na eme o. Adim mbada okay😂😂😂💋
DeleteAmanda, ekelekwa m gi nwanyi oma, I ga-ada na aha Jisos.
DeleteJisike, Sandy yo!
DeleteUmunne m omenu !!!!
ReplyDeletengwa putabanu, ka anyi suo IGBO
Stella iji ya, kuoro Onwe gi aka...hehehe.
Burn Igbo��
DeleteIgbo amaka
DeleteBurn ke?
DeleteNwa ada Amanda Favour Olisa bi n'igwe gozie gi nke oma.
ReplyDeleteBiko ubochi ozo i kenesia umu Igbo ibe m(Igbo kwenu ) I tenye kwa "Awkuzu ekene m unu" maka na obodo m bu Awkuzu anaghi ekwe ekwe, inugo nwanyi oma? Lol
Dalu!!!
Awkuzu
DeleteAh Chike Chyko!
DeleteI bu onye Awkuzu?
Chai!
Kita ka mu ghotara ife mere iji enye nsogbu ebe a. Nwa Awkuzu ka I bu?
Okwa Nwa nna ka I bu!
Odogwu nwoke!
DeleteAnula m ihe ikwuru
Nwanna, ole way?
DeleteNwunye G abu m Nwa afo Awkuzu, nwanne Igwe John Nebeolisa, Awkuzu ka ome, Awkuzu emena emena Awkuzu emekwa ozo... Lol
DeleteYa bu n'ekwesiri ina-egbuchapurugi ebe opuru iche?@chike
DeleteO chim! Nsogbu dikwa. Ngwanu oo Amanda inulanu.
Igbo bu igbo ya gazie ooo
Ogiri-yoruba
ReplyDeleteMbah kwa o
DeleteHahahaha
DeleteJukwaa ndi yoruba
Lucile ADA oma ekele m gi
DeleteLucile oburo eziokwu!...
DeleteImaro ife inekwu
DeleteOgiri bu Igbo
DeleteOgbono bu igbo
Mba kwa nwanne'm,ogiri bu igbo. Ogiri na yoruba bu iru. Akamu bu kwa igbo, hausa na kpo ya kamu mor bu koko. Ogbono bu nu igbo nu, yoruba amaho ihe bu Ogbono ooo...Dalu unu umunna na umunne.
DeleteAmanda favour abiala ooo...can't come and kii maself ontop reading igbo,its too konk.Ah ah abeg explain what you wrote in igbo to english for me joor or summarise.Nice one though
ReplyDeleteEkwunwe kwa na!!! 🙊🙊🙊
DeleteEspeakilekwene espeak!!! 🙊🙊🙊
Oputara na ibu onye Igbo mana imaghi asusu igbo as? Lol
Esther Mgbolu hichapu aka ijiri dee ihe a
hahaha... Esther Jisike guo ya, I ga aghota ya
DeleteHia oh okwa afunuro
DeleteOnye nke bu, mama m gwara m na mbu onye Igbo.
DeleteUnuu sii gini?lol you bvs need to see ma face concentrating,trying to read this,hahahahahahahahahahaha... some one saw ma serious funny face and mouth twisting,reading,trying to comprehend what i was reading and snapped me,chisos my facial expression was epic
DeleteEzikokwu ka ikwuru Priscababe!...
DeleteAsi ndi Igbo puta,Esther Mgbolu etiri ka nwamba maputa!...
Ihea bu ihe ihere!!...
Biko ndi nne na nna no ebea,kuzibere nu umu unu asusu Igbo!...
A na m asuru umu akam Asusu Igbo...ha na aghota kwa ya nke Oma!...
Queen and boss, ihe ikwuru by ihe mere eme. O kwa asiri anti subakwa Igbo.jisie ike subara umu gi Igbo.
DeleteAnambia!😂
ReplyDeleteAnam abia not anambia... Lol
DeleteEtsako pearl Daalu nne
Deletehow can i read what i dont understand
ReplyDeletewaiting for yoruba turn sha
Mbo lo ti wa?
DeleteOya ema lo jor...
Sari lo jor... Lol
Bashiru Onye ofe, mechie onu gi ebe afu
DeleteAmarom ihe bashiru na acho ebe a!...
DeleteBiko nyere anyi Efe!...anyi achoghi unu!...
Lols, Queen queen
DeleteAmanda kedu? Idi ofunma
ReplyDeleteNdewo ooo ndi yardi nkem
Bia nwanyi a, ibudi Onye Igbo? Eh gi yori yori!
DeleteYori yori nwa!
DeleteOma una ASA ahu!
Ana m ekele
apasa m na ogbe
udodi
*uma*
DeleteYori Yori Nwa!!! Ewoo men pasa n'ogbe, juo ese I ga ahu na ha bu alobam.
DeleteHahahahaha Chike na arapuzi egwu Phyno...
DeleteLmao
Nna mehn...nsogbu di ebea. akuko na egwu ga eju here now. tueee tueee Ala nwa nyi Asaba Sharumi
ReplyDeleteHahahahahhahaha...
DeleteBloogu - English
ReplyDeleteIgbo amaka...
Ebea ka mu ga ehi ura ubochi taa.
Nwa ada Amanda Favour ekene ooo.
Oga diririi gi na mma.
Afo juputara m na obi uto maka osisa gi a. Imela nwannem nwanyi.
Igbo amaka nwanne!👍🔊🔊🔊👊
DeleteIgbo amaka😘😘😘
DeleteNwa Ada Amanda, oge n'adighi anya, Biafra nwere onwe ya, aga enye gi onye isi edemede obodo biafra. Jisieike nwa ada di nma!
ReplyDeleteEnwere otutu okwu mbite n'asusu di iche dika,
Restaurant: ndi oyibo bitere ya n'okwu french!
Just Krix!
E chiem e nor na abroad? Igbo gi manma o. Jisike nwoke oma. Ke maka ochiria Lizzy?
DeleteLingerie e bite kwara ya Na okwu French.
DeleteEkene mu gi Mazi Krix!
Eji m Na-aka na aru di gi Na ezi n'ulo gi.
Oriaku anyi a?
Tuolu mu ya afa!
Tuolu m ya "Di Malu anu"
Krix nwoke oma biko, bikonu, bikozianu bia laa nu mu otu. Adim serious papa. Igu gbugom💋💋
DeleteHahaha mazi krix, Ana m ekele o!
DeleteEnyekwa m oru a ,o maka kwa...hahaha
Daalu rinne nwoke oma Ndi IGBO ji eje mba
Restaurant by ulo erimeri ngwa kenee mu
DeleteAnon 14;16, o bu krix na-agu gi ka o bu ego ya? Kwuo eziokwu!
DeleteI na-acho ezi na ulo I ga etisa
ADA Delilah!
Hahahahahahhahaahahhaha
DeleteAnon 14:16...
Isi emebigo gi!...
Ichoro itinye Kris onye mgbasa ozioma chukwu na onwunwa!!...
Kris Ngwanu,bia laa nwa Ada a otu!...
Osi na ife gi na amasi ya...
Kwakwakwakwa...
LMAO🤣🤣🤣🤣🤣🤣🤣🤣
DeleteHahahahhahahahaha chai!
Ebee ka ufodu si puta bikonu?🤣🤣🤣🤣
LMAO @bia laa nu mu otu Papa🤣🤣🤣
Lol
DeleteLmao
Lwkm
Hahahahahahahahahahahahahahahaha
Anon 14:16 ishi nini?
Nwunye G, anon 14:16 si na OTU wee puta. Ya mere ila otu gi ato ya uto nke ukwu.
Lol
DeleteKris onye Nna bia ka ila ya otu.
Otinyere kwa papa... Lol
Nwunye General, Ndi igbo anaghi adult lingerie. Ha na akpo ya Peteri ma obu durosu. O bu Ndi bekee biters lingerie from French
DeleteChike Chike, akota nke di onye oria mma osi dozigodu ya isi. Ochi si ka otgbuo'm!
DeleteAnon 14:16 Biko chegharia ma nabata onye nzoputa na ime ndu gi.
Nkea bu okwu ofuo (papa)
Just Krix!
Okwu so! O ka ihe nracha sia ami...
Delete🤣😂😂🤣🤣🤣
DeleteAnyam afula ntim
Anonymous 14:16
Chim oooh! Efuom oooh
🤣😂😂😂😂
Oooo Chimoo(OMG)!
DeleteOnye a osi na owu gini?
Cheagharia nwanne m nwaanyi, Jisos na abia n'oge na-adighi anya.
#kwusiIko
#kwusiAguuMmekoahu
Igbo ndi oma na ege nti, enwerem otu ajuju, ajuju'm bu nkea, onye ihuru n'anya, iga akpachapu anya mee ya ihe ojoo?
ReplyDeleteUbochi nta anyi achuo na owerri nchi!
Just Krix!
MBA!!!!
DeleteAziza maka ajuju gi a bu Eeh.
DeleteNdi be anyi siri na onye ma mmadu na egbu ya.
Mana ama m na obu maka Stella ka ijiri juo ajuju a... Lol
Otee la omebere gi many many things... Lol... Ndo onye oma Kris. Ahotaram ka osi eme gi.
Lol!!
Delete@krix,osisa ajuju gi bu MBA!!!
Kedu ife mere iji aju nkea nwanne??
O nwere onye mere gi ihe ojoo??
Biko gbalia nwebe obi anwuri ubochi niile..Uwaa enwero ife di na ya..
Jisie ike!! Chukwu gozie gi..
@MARTINS ABOY
Chai,ima Nno etu esi ede igbo
DeleteMba!!!
DeleteMaka na onye obula I huru na-anya bu so ihe ga na-ato ya uto ka I gana eme
Chike,Ogini ka Stella mere Kris?...
DeleteLol
DeleteHahahahahahahahahahahahahahahaha
Queen na Boss okwa ngi hapuru Stella owere Ola di gi na Sexy Spermy Daddy wee na eme Kris ihe mgbawa obi...
Hahahahahagahahha
DeleteObi mgbawa is real, ndo o Oga Khris
Oziza ajuju gi a bukwa KAPITA EHH, 'obi di aghugho' nwannem
Deletekedu ihe ojoo kariri di ma obu nwunye ina aghogbu (cheat) nwunye ya, ma obu ya na nwanyi ozo ana edina ebe onwere nwunye n'ulo.
Hahahahaha
DeleteChike,gbaa mu okpa na eze!...
Stella,emero nke Oma...Kris biko gbahara ooh
Lool! Oburo obele Ife. Biko gini bu Boolu na Bokwu na onu oyibo? Daalu so!
ReplyDeleteOburo Obele Ife
DeleteBoolu bu ball
DeleteIfe ana-akpo Bolu bu Ife ukwu egwuri-egwu.
Delete😂😂😂😂😂😂😂@TGW...
DeleteOops! Ed daalu!
DeleteHahahaha! Nwuge G a sef! Afum na Ife di na ukwu na ato gi pieces😉😜
Bokwu bu plenty na onu oyibo
DeleteNwunye G Ana m achiliri gi aka Beyonce na jay-z elu...hehe
DeleteHahahahahahahahahaha...
DeleteSandy Yo Nwa oma eji eje mba
DeleteAmanda Nwa oma!
DeleteNne Ekene mu gi o!!!!
Nne iga adi o!
ReplyDeletei naanị ịghọta ihe ole na ole n'ebe a, nwere ike onye biko ịsụgharị
Ok
ReplyDelete*Larry was here*
Hmmm Nwanne m Nwanyi AMANDA FAVOUR..A Na-eme Ekele gi o..Daalu oo..Ji si ike inu Nwanne m...SDK blog ebe o na kpotu...
ReplyDeleteDaalu onye oma
DeleteNd'alu nnwayioma. 👏
ReplyDeleteVery educative.
Kedu maka ahia?
Yes Stella osikapa bu rice, igbaliri.
Daalu nwanne mmadu
DeleteAhia na-aga nwayo nwayo
Nemerem ka ubochi taa shiri gaa?
DeleteIgakwara ofuma?
Ndo.
Oga ooo... Yoruba abeg, do una won na
ReplyDeleteAfi won. Kikikiki Anumanu
DeleteNwanne nnwayi Amanda, hmm jisike, Ndewo nu ndi ba enyi, azuzu anyi amaka
ReplyDeleteOkwano azuzu. Chai! Biko o bu asusu
DeleteDaalu nwanne m
DeleteNwa Ada Amanda,dalu rinne,okwu GI kwu oto dika ife umunwoke ji anyu mamiri😂😂😂😂😂😂😂😂
ReplyDeleteEnwere otutu okwu mbite di iche iche dika:
Faanu- Fan na ndi ozo....
Afurum unu na anya rinne😘😘😘😘😘😘😘
Hahaha B.V Ed, imebisigo
Deleteo kwa na okwu m kwu oto dika ofe Umunwoke ji anyu amiri...hahaha
Lol..
DeleteBia Ed akuko adighi mma... Lol
Ishi nini?
Ed onye mere gi ihe? Lol
DeleteElastic oma kwa na idi ona? Lol
Ajo ife nato amu... Hahahahahahahahahahahahahahahaha
Igbo bu igbo mmammanu o,Amanda inwaka oo!nwanyioma,stella onu na ekwuru ora na germany! Ekene kwam gi oooo!ka ogara anyi nile oo!ka kwanu nka umu nnem! Giant -english,bikonu gini bu BLUE na igbo,suya ,yabasi-hausa, JIGIDA-HAUSA AGIDI -YOURBA AKAMU-YORUBA ASHAWO- #udo
ReplyDeleteDaalu onye oma
DeleteIGBO nwere mmadu !
Blue putara anunu...
DeleteAgidi bu igbo, o ekò bu Agidi na asusu yoruba. Jigida bu kwa igbo, ndi yoruba bu ileke ka ha na kpo ya na asusu ha. Dalu kwa nu.
DeleteEeeyioo! I zatatara ya nwada Stella, Osikapa but Uroisi, ufodo n'akpo ya raisi. Bv Amanda ejim ezigbo Ekene n'ebe oburu ibu n'etu isi agba nnukwu mbo ihu na asusu anyi Ka n'eku ume. karichaa na odide na ogugu ya. Mana otu nnukwu nsogbu m nwere bu na umum na aghota asusu Igbo nke oma, mana ha amaghi asu ya!. onwere otu mgbe mu na ha so gaa nmeme, Nnem na nnam ajuo ha ajuju, umum kedu Ka unu mere? osisa ha atoghi uto na nti Chaa Chaa! Ha Zara si, odi Mma! Mana odara Ka mgbe onye Ocha na asi odi Mma.
ReplyDeleteBv Amanda favour, onwere otu ezigbo ajuju Di ezigbote mkpa m choro Ka anyi Nile by ndi Igbo no na bloogu a saa, onye obuna zatara ya, ga enweta ozim mgbe na adighi Anya. Ihe kpatara mji choo iju ajujua di oke mkpa bu maka na izu uka gara aga, anyi gara mmenme ncheta omumu nwa afo asaa, ndi ocha wee na aju anyi Nile bu ndi Igbo etu esi agu "happy birthday to you" anyi Nile kpudoro ihu n'ala n'ihi nnukwu ihere Juru anyi Anya. Anyi si ha na anyi amaghi etu esi agu ya bu egwu n'igbo. Mgbe anyi lotara n'ulo, mkpoo Nnem na nnam n'ekwe nti, juo ha ma ha ama agu ya bu egwu, mana owute kwaram ebe odi ukwuuuu na ha amaghi ya agu!
Ejim akaa, akpoku umunnem Nile no ebea, biko Ka unu gbataram oso enyemaka. 'Bv' Amanda, Chike, "Bloogu Eze", TGW, kwiiinu na Booozu, Sandy Yo! Na umunnem ndi ozo, biko nuooo
Happy - obi uto
DeleteBirthday - ubochi omumu
To - diri
You - gi
Oya sing
Obi uto ubochi omumu diri gi x4
Ngwa kene m... Lol
Onye Ajuju ekene mu gi o!
DeleteIgaghi Efu uzo ooo!
I ga adi o!
Iseeee!
Onye ajuju, eziokwu m a maro m ka esi agu egwu a n'IGBO. Mana I nwere ike igu ya etua ...
DeleteNuria na ubochi omumu gi Nuria na ubochi omumu gi
Nuria na ubochi omumu gi
Nuria na ubochi omumu gi
Afo ole ka I Di taa
Afo ole ka idi taa
Afo ole ka idi taa
Afo olee ka idi taa ?
Adi m afo ........(4x)
Nke a bukwa aziza nke m, onye nwere ike inyere anyi aka biakwa biko
Daalu nu Umunne m
Happy birthday to you putara anuri ncheta omumu gi
DeleteHahahahahahahah...
DeleteOchi atogbuolam!...
Nwa Ada Amanda egbuola,inu mu ooo..
Nke bu eziokwu bu na egwu ahu Abughi egwu ndi Igbo...
Hahaha, Linda , isikwanu m kwuo gini?
DeleteAga m eme nchoputa maka egwu a
Linda, onye echichi ana m ekele o !
Zere nke I chiri
Lekwanum anya! Happy birthday by egwu oyibo, guoro ya egwu Igbo obula gbataragi na obi, tinye egwu ekpili na ya, ha ncha sokwa!
DeleteNdi igbo anaghi ekpeazu!
Just Krix!
Onye ajuju ihea buru ibu
DeleteNara aka iri na abuo🙌🙌🙌🙌
Happt birthday wu ,ezigbo ubochi a muru gi.
DeleteHian! Ochi atokalam ahu, haha hahaha haha hahaha
DeleteAmanda Yo, biko sandy hapum ka m gbaziri 'yo' gi a.
egwu nkea atolam ochi@Amanda yo. Igbaliri mana ñuria putara (rejoice)
Mana, egwu ahu bukwa egwu ndi bekee, oburo nke anyi)
Anyi ekele unu oooo
ReplyDeleteEkele diri gi onye na enwehu aha.
DeleteKedu ka imere?
Igbo Mmama nu o!
ReplyDeleteNuo nu!
Rie nu!
Zuo nu!
Kachaa nu!
Igbo mmama nu o!!!!!
Igbo Ekene mu unu o!
Iseeeeeeee!!!!
Nnoooo!
DeleteNwunye G, ijele Nwanyi ikara aka
DeleteOriaku G Ekele m gi
DeleteO ga adiri gi na nma Uye G!...
DeleteOgologo ndu na oganihu na ahu ike zuru oke bu nke gi ma TG mama
DeleteLolo Igwe aka CHIEF aka Queen and Boss, oke mmuo na eti onwe, agu nwanyi, ijele na onwe ya, Nwanyi oma I bu tam tam... Ekene ooo
DeleteEbe ka ino kemgbe?
Pipi Yooo! Iseeeee!
DeleteChief! Ekene mu gi o! Nwa Nne m onye Oga adiri nma!
Chike nwoke Ike! Nna iga adi ooo!
Ed Nwoke oma,nna Oga-adiri gi nma!
Amanda Nwa Ada anyi ji eme onu,Nne Udo!
Nwuye G ndewo, nwanyi igbo bu igbo ji eme onu, asim kam kele gi. Chukwu gozie gi ma chebekwa ezi n'ulo gi.
DeleteJust Krix!
Mmama oooh
DeleteMmama ndi igbo ibem kara aka
DeleteKrix nwoke oma nara ekele.
DeleteChickyclassy onye owerre ebe ka anyi. Arim mma daaaaa.
Pipilastic nwata agbohobia m nlutara Anthony J kedu?
Hahahahahahahahahaha.
DeleteIphie m, Iphie mama! Onye nkem! Onyem worldwide!
Ndi Igbo but Umu Isreal
ReplyDeleteIgbo amaka biko
hahahahah Anon 14:12 ogini
ReplyDeleteAkala yoruba
ReplyDeleteU people are just wicked ooo
ReplyDeleteDo want to kill me with these language
Stella pls bring Edo people own...
I have to understand this language ijn amen😂😁😀
Pay me let me teach you... Lol
DeleteUmunnem mmama nu.
ReplyDeleteUnu mere ofuma nkeukwu
Naranu aka na elu🙌🙌🙌🙌
Iphie Dearie so I bu otu n'ime ndi "famous" ato... Lol
DeleteUdo diri gi
Ndi b'anyi ndewo nu o! Kee ka eke si anya anwu? Igbo ga di
DeleteIphie nwanyi oma Daalu !
DeleteEkele m gi o !
Nnem oooo, nwanyi oma
DeleteEkele kelere Amanda🙌
DeleteIfeoma onye ofu aham,Ekele kam jiri bia.
Chike,nwoke ukwu na onwe ya,Kedu kwanu otu esiri chufu gi na group nke eji eme party?
Iphie,I mela mkpole?...
DeleteAsusu ndi be unu na atom!...
Arim mma daa LinLin
DeleteMy tomatoe chara acha♥️
Asa Nwa oyoyo m o💋
DeleteNwa ada Amanda Favour imeela o. Umu igbo subanu igbo n'igbo amaka. Ndewonu
ReplyDeleteDaalu onye oma
DeletePipi Lee the Medusa Nwa oma idi na udi gi. Nwa ikporu akpo ka chin-chin... Ekene ooo
DeleteAmanda nwanyį öma,ekelekwa m gį
ReplyDeleteE ji m na-aka n'ahu sigbodoro gi na Ndi nke gi ike?
Okwu Ndi ahu įkporo okwu mbite,nwekwara ihe anyi na-akpo ha na-asusu Igbo. Gbalia ka įchoputa ha ma meekwa ka Ndi be anyį Ndi na-amaghį mara ha.
Ana m ekelekwa gi na etu isiagbali akwalite asusu Igbo. Ka onyenwe anyį gbaa gį ume ezi Ada.
Daalu TM,ezigbo mmadu
DeleteA nuru m ihe I kwuru
Chukwu gozie gi nne
Amaghi kwam na ndi Igbo anyi na asu bokwu-plenty. Anukwaram na anyi bitere Ichafu n'aka ndi frenchi. Igbo mmamma nu. BV Amanda, daalu nne, biko onwere ife m choro irio gi, Dee maka okwu ntabi ire, o tee go kwa. umu nnem, ka odi...
ReplyDeleteDaalu nne
DeleteIgbo kwenu, rie nu, chienu eze!
ReplyDeleteIsee !!!!
DeleteAsusu Igbo ebuka. Odikwa iche iche na Obodo bebe. Ahotaram ihenine ederi bu na nmu wa enweroike isu udiri nka. Jisi nu Ike.
ReplyDeleteDaalu onye oma
DeleteUni igbo kwen u! Keep ze nu ✌️
ReplyDeleteAmanda Nwanyi oma, Imeela. Okwu torom ochi ebe I kporo Nwa mmadu "Ada Delilah". Onye ahu enweghi ako n'uche.
ReplyDeleteKa m kuziere unu etu esi ama okwu mbite
ReplyDeleteMgbe o bula I hürü üda nfe na üda aro ka ha di na otu mkpuru okwu mara na ya bu okwu dara iwu nke nsugbe. Nyochakwa ya bu okwu n'ihi na ötütü okwu ndi dara iwu nke nsugbe bü okwu mbite.
Ö bürü na m nwe oghere,a gam abia kowa ya bu okwu ka odo anya.
Udo diri ünü ümünne m.
TZ onye nke m!
DeleteNwanne m were nsusu💋💋💋
Mmeri zion
DeleteNwunye G,Onye o ga-adiri mma. A na m ekele.😘😘
DeletePipi,Nneoma kedü ka į mere? Daalu so
Adi m mma, daalu Ada Mazi.
DeleteLmao Jelly! What was that? Loool
ReplyDeleteWaoh! so this is a confirmation that,
ReplyDeletena only Igbo people full this blog. Odiegwu really.
Relax owu turn by turn😀
DeleteAtula egwu, oge nke unu na-abia.
DeleteMeanwhile, anyi n'achi n'ebe nile. Nke ahu bu oru anyi (na d work wet we dey do be this)
Nekwanu ndi ufu obi!!...
DeleteNdi jelosi jeloma!...
Ndi Igbo bu ozuru mba onu!...
Lmaoooooooo
DeleteEze nwanyi herself!!
Always dropping it hot.
Odikwa mma ka anyi muta na asusu igbo nwere usoro eji ede ya. Dika iji (na) na-edemede ngwaa. Ngwaa nke nwere nga n'ihu ya bu 'e' na 'a' biko etinye kwana ya n' (na rikom), tinyere ya na- (na akara uhie).
ReplyDeleteEg. Ano'm n'ulo nkwu. (na rikom)
Queen na-acho okwu nke ukwuu. (na akara uhie)
A no m n'ulo.
DeleteHahahaha..
DeleteDear Stan,I dere ya nke Oma!...
Ide igbo izugbe na ahia aru...
Kedu ije gi nwanne?..ihuru ozi m?...
Queen ezigbo oyim dalu, adim mma. Kedu ka imere? Afuro'm ozi gi biko je na-akpati ozi gi ka ifu nke'm dere gi.
DeleteIgbo amaka,umu igbo ekelam unu o, igbo amaka.ya gashie la nnu ,Stella Rice wu osikapa.
ReplyDelete